Faịlimọn ISI NKE 1 1 Pọl, bú onye-nkpọrọ nke Jisus Kraist, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara Falimọn, onye ayi huru n'anya, na onye-ibe-ayi; 2 na ziga-kwa-ra Afia, bú onye ayi huru n'anya, na Akipọs onye-agha-ayi, nēdega-kwa-ra nzukọ-Ya nke di n'ulo-gi; 3 Amara diri unu, na udo, sitere na Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 4 Anam ekele Chinekem, N'nēhota Gi mb͕e nile n'ekperem nile; 5 Ịnụ okwu ịhụnanya na okwukwe gị, nke i nwere n’ebe Onye-nwe-anyị Jisọs nọ, na n’ebe ndị nsọ nile nọ; 6 ka okwu nke okwukwe-gi we gwusi ọlu, site n'ikweta ezi ihe ọ bula nke di nime gi nime Kraist Jisus. 7 N’ihi na anyị nwere nnukwu ọn̄ụ na ngụgụ obi n’ịhụnanya gị, n’ihi na obi dị ndị nsọ naenweta ume site n’aka gị, nwanna nwoke. 8 Ya mere, ọ bụ ezie na m nwere ike inwe nkwuwa okwu n’ime Kraịst inye gị iwu nke kwesịrị ekwesị; 9 Ma n’ihi ihu-n’anya ka m’nāriọ Gi, ebe m’nwere dika Pọl, bú agadi, ma ub͕u a bu kwa onye-nkpọrọ nke Jisus Kraist. 10 Aririọm Gi bayere nwam Onesimọs, onye M'muworo n'ab͕um; 11 Nke nābara gi uru na mb͕e gara aga, ma ub͕u a ọ baara mu na gi urù; 12 Onye M’zigaraworo ọzọ: ya mere gi onwe-gi nara Ya, ya bu, obim; 13 Onye m’nāchọ ijide n’akam, ka o we jeworom ozi n’ọnọdu Gi n’ab͕u nile nke ozi ọma; 14 Ma ma-ọbughi uche-gi ka m’gaghi-eme ihe ọ bula; ka urù-gi we ghara idi dika ọ di nkpà, kama ọ bu n'afọ-ofufo. 15 N'ihi na eleghi anya o we pua nwa oge, ka i we nara Ya rue mb͕e ebighi-ebi; 16 Ọ bughi ub͕u a dika orù, kama ọ bu kari orù, bú nwa-nne m’huru n’anya, nke kachasi n’ebe m’nọ; 17 Ya mere ọ buru na i gum onye-nnwekọ, nara ya dika Mu onwem. 18 Ọ buru na o mejọwo gi, ma-ọbu na o ji gi ugwọ, tukwasi ya n'akam; 19 Mu onwem Pọl jiwo akam de ya, si, M'gākwughachi ya: ọ bu ezie na asighm i gi otú i jim ugwọ ọbuná gi onwe-gi ma-ọbughi nání. 20 E, nwa-nna-ayi, ka m'ṅuria n'aru Gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Onye-nwe-ayi. 21 Ebe m’nwere obi ike na nrube-isi-Gi ka m’degara gi akwukwọ, ebe m’mara na i gēme kwa kari ihe m’nēkwu. 22 Ma n’ezie, dozierem ebe-obibi: n’ihi na atukwasiwom obi na agēwere ekpere-unu nye unu. 23 N'ebe ahu ka Epafras, bú onye-nkpọrọ ibem, nime Kraist Jisus, nēkele gi; 24 Makọs, Aristakọs, Demas, Lusa, bú ndi-ọlu ibem. 25 Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.