Ọ ṅuru ufọdu nime manya-vine ahu, ṅubiga kwa manya ókè; ewe kpughepu ya n'etiti ulo-ikwū-ya. Noa we teta na manyavine-ya, mara ihe nwa-ya nke-ntà mere ya. Jenesis 9:21,24 Lot we si na Zoa rigo, biri n'ugwu, ya na umu-ya ndinyom abua; n'ihi na ọ turu egwu ibi na Zoa: o we biri n'ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua. Ọkpara we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n'uwa nke nābàkuru ayi dika uwa nile si di: bia, ka ayi me nna-ayi ka ha ṅua manya-vine, ayi gēso kwa dina. ya, ka ayi we chekwa nkpuru nke nna-ayi. Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n'abali ahu: ọkpara-ya we ba, soro nna-ya dina; ma ọ mataghi mb͕e ọ nēdina ala, ma-ọbu mb͕e o biliri. O rue n'echi-ya, na ọkpara siri nke-ntà, Le, mu na nnam dina n'abali nyahuru: ka ayi me kwa ya ka ọ ṅua manya-vine n'abali a; ma gi onwe-gi ba, soro ya dina, ka ayi we chekwa nkpuru sitere na nna-ayi. Ha mekwa-ra nna-ha ka ọ ṅua manya-vine n'abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na ya dina; ma ọ mataghi mb͕e ọ nēdina ala, ma-ọbu mb͕e o biliri. Jenesis 19:30-35 Jehova we gwa Eron okwu, si, Aṅula manya-vine ma-ọbu iheọṅuṅu nābà n'anya, gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi, mb͕e unu nābà n'ulo-ikwū nzute, ka unu we ghara inwu: ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile; Ma ka unu we kpa ókè n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, na n'etiti ihe nādighi ọcha na nke di ọcha; Ma ka unu we zí umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha n'aka Moses. Levitikọs 10:8-11 Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nwoke ma-ọbu nwayi gēkewaputa onwe-ha ib͕u nkwa onye-Nazirait, ikera onwe-ha nye Jehova: ọ gēkewapu onweya na manya-vine. na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu manya-vine nke ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ọ gaghi-aṅu kwa ihe-ọṅuṅu nke nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine nke miri emi, ma-ọbu nke akọrọ akọrọ. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ gaghi-eri ihe ọ bula emere site n'osisi vine, site n'ọka we rue mb͕e ọ bula. Ọnụ Ọgụgụ 6:1-4 Ma ọ sirim, Le, i gāturu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya. Ndị Ikpe 13:7 O rue, mb͕e ọ nēkpe ekpere n'iru Jehova, na Ilai we hu ọnu-ya. Ma Hana, o kwuru n'obi-ya; nání eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nāb͕aghari, ma anānughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigawo manya ókè. Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i gāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n'aru gi. Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-mwuta ka m'bu: ọ dighi manyavine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu ka m'ṅuworo, kama awusiwom nkpuru-obim n'iru Jehova. 1 Samuel 1:12-15 Abigail we biakute Nebal; ma, le, o mere oriri n'ulo-ya, dika ememe eze; obi Nebal we di ọṅu nime ya, n'ihi na ọ ṅubigaworo manya ókè: o we gosi ya ihe ọ bula, ma-ọbu ihe di uku, rue ìhè ututu. O rue, n'ututu, mb͕e manya-vine siri na Nebal pua, na nwunye-ya we gosi ya ihe ndia, na obi-ya nwusiri nime ya, ọ we di ka nkume. O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gasiri, na Jehova tib͕uru Nebal, na ọ nwua. 1 Samuel 25:36-38 Ma Absalom nyere ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya mb͕e obi Amnon di utọ na manya-vine, mb͕e m'si kwa unu, Tib͕ue Amnon; me ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi Mu onwem nēnye gi iwu? di ike, di kwa uko. 2 Samuel 13:28
I tinyewo obi-utọ n'obim, Kari na mb͕e ọka-ha na manya-vineha bara. n'udo ka m'gēdina, raru ura: N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, nání Gi nēme ka m'biri na ntukwasi-obi. Abụ Ọma 4:7-8 Abàla n'uzọ ndi nēmebi iwu, Abà-kwa-la n'uzọ ndi nēmebi iwu. Zere ya, agabigala ya, si na ya pụọ, gabiga. N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha emeghi ihe ọjọ; ewe wezuga ura-ha, ma ọ buru na ha emeghi ka ufọdu da. N'ihi na ha nēri nri ajọ omume, nāṅu kwa manya-vine nke ihe-ike. Ilu 4:14-17 Onye nākwa emò ka manya-vine bu, ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ bu: Ma onye ọ bula nke eji ya ghọb͕u ab͕a, amaghi ihe. Ilu 20:1 Onye nāhu ihe-utọ n'anya gābu ob͕eye: onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-aba ọgaranya. Ilu 21:17 Ònye nwere ahuhu? ònye nwere iru uju? ònye nēse okwu? ònye na-ekwu okwu? ònye nwere ọnyà n'efu? ònye nwere anya nācha ọbara-ọbara? Ndi nānọgide na manya-vine; ndi nēje ichọ manya-vine agwara agwa. Elegidela manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, mb͕e ọ nēnye urù-ya n'iko, mb͕e ọ nējeghari onwe-ya nke-ọma. N'ikpe-azu ọ nāta dika agwọ, Ọ nāta kwa dika aju-ala. Anya-gi abua gāhu ndinyom ala ọzọ, obi-gi gēkwu kwa okwu b͕agọ ab͕agọ. E, i gādi ka onye nēdina ala n'etiti oké osimiri, ma-ọbu dika onye nēdina ala n'elu akpu. Ha etib͕um, ka i gāsi, ma mu onwem ariaghi aria; ha etiwom ihe, ma m'gaghi-ama: òle mb͕e m'gēteta? M ga-achọkwa ya ọzọ. Ilu 23:29-35 Ọ bughi ndi-eze, Lemuel, ọ bughi ndi-eze ka ha ṅua manyavine; ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya ndi-isi: ka ha we ghara iṅu, we chezọ iwu, we b͕agọ ikpé nke onye ọ bula nime ewedara n'ala. Nye onye di njikere ila n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye kwa ndi obi-ha di arọ́ manya-vine. Ya ṅua, chezọ kwa ob͕eye-ya, Ka ọ ghara icheta kwa nkpà-ya ọzọ. Ilu 31:4-7 Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu, ka ha we jeso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; nke na-adịgide ruo abalị, ruo mgbe mmanya naere ọkụ. Ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ọjà, na manyavine, di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine nile ha: ma ha adighielegide anya n'ọlu Jehova, ha echeghi kwa omume aka-Ya abua. Aịzaya 5:11-12 Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nādabere ọchichiri n'ọchichiri, na ìhè n'ọchichiri; Nke nētiye ilu n'ọnọdu utọ, nātọ kwa utọ n'ọnọdu ilu! Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya onwe-ha, na ndi nwere uche n'anya onweha! Ahuhu gādiri ndi bu dìnkpà iṅu manya-vine, na ndi-dike itule ihe-ọṅuṅu nābà n'anya: ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi ugwọ-ọlu, nānapu kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya! Aịzaya 5:20-23 Ahuhu gādiri okpu-eze npako, bú ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ndi ima-nma-ya bu okoko-osisi nākpọnwu anwu, nke di n'isi nke ndagwurugwu di abuba nke ndi manya-vine nāb͕apu; Ma ha ejehiewo site na manya-vine, ọ bu kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha puworo n'uzọ; onye-nchu-àjà na onye-amuma emehiewo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine lodawo ha, site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha pua n'uzọ; ha nēhie uzọ n'ọhù, ha nāsu ngọngọ n'ikpé. Aịzaya 28:1, 7 Okwu nile nke Jonadab nwa Rikab, nke o nyere umu-ya ndikom iwu ka ha ghara iṅu manya-vine, emewo ka ha gwusia;
n'ihi na rue ta, ha adighi-aṅu ihe ọ bula, ma ha nēge nti n'ihe nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawom unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu okwu; ma unu egeghim nti. Jeremaịa 35:14
nwere uche, onye ezi omume, onye di nsọ, onye nāhughi anya; Nējisi okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi ike dika amuworo ya, ka o we nwe ike site n'ozizí ezi omume ka ọ nādusi kwa ndi nēkwuhie okwu ike. Taịtọs 1:7-9
Ọ dighi kwa onye-nchu-àjà gāṅu manya-vine, mb͕e ha nābà n'ogige di nime. Ezikiel 44:21
Ma gi onwe-gi nēkwu okwu nile nke nāghọ ezi ozizí: ka ndiokenye we nwe uche, nēnwe ezi uche, nēnwe obi iru ala, nēguzosi ike n'okwukwe, na ihu-n'anya, na ntachi-obi. Ndindinyom meworo agadi, ka ha we me omume dika o kwesiri idi-nsọ, ọ bughi ndi nēbo ebubo ugha, ka ha ghara inye manya-vine ọtutu, ndi nēzi ezi ihe; Ka ha we kuziere umuab͕ọghọ ahu inwe uche ziri ezi, ka ha hu di-ha n'anya, ka ha hu umu-ha n'anya, ka ha bu ndi nwere ezi uche, ndi di ọcha, ndi nēche nche n'ulo, ndi di nma, nērubere di-ha isi, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke. Ụmụ okorobịa na-agbakwa ume ka ha nwee uche ziri ezi. Taịtọs 2:1-6
Ma Daniel zubere n'obi-ya ka ọ ghara iji òkè-ihe-oriri nke eze na manya-vine ọ nāṅu meru onwe-ya: o we riọ n'aka onye-isi ndi-onozi ka ọ ghara imeru onwe-ya. Daniel 1:8 N'ihi na ha gēri ihe, ma afọ agaghi-eju ha: ha gākwa iko, ma ha agaghi-aba uba: n'ihi na ha arapuwo ige Jehova nti. Ịkwa iko na mmanya na mmanya ọhụrụ na-ewepụ obi. Hosea 4:1011 Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na anuru ekpere-gi; nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn. I gēnwe kwa ọṅù na ọṅù; ọtutu madu gāṅuri kwa n'ọmumu-ya. N'ihi na ọ gādi uku n'anya Jehova, ọ dighi kwa manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gāṅu; ma ọ ga-ejupụta na Mụọ Nsọ, ọbụna site n’afọ nne ya. Ma ọtutu umu Israel ka ọ gēchigharikute Jehova, bú Chinekeha. Luk 1:13-16 Ya mere, lezienu anya ka unu nēje ije nke-ọma, ọ bughi dika ndi-nzuzu, kama dika ndi mara ihe, nāb͕aputa oge ahu, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. N'ihi nka unu abụla ndi-nzuzu, kama ghọtanu ihe ọchichọ Jehova bu. unu ekwe-kwa-la ka manyavine nke nwere ngabiga di nime ya ṅubiga manya ókè; ma juputara na Mụọ; Were abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nāgwa onwe-unu okwu, nēwere kwa Onye-nwe-ayi bù abù, bù kwa abù ọma nime obi-unu; nēkele Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; Naedonụ onwe unu n'okpuru ibe unu n'egwu Chineke. Ndị Efesọs 5:15-21 Nka bu ezi okwu, Ọ buru na onye ọ bula nāchọ ọnọdu onyeisi-nchu-àjà, ọlu ọma nāgu ya. Ya mere, bishọp aghaghi ibu onye zuru okè, di nke otù nwunye, onye nēche nche, onye nwere uche, onye nwere ezi omume, onye nēle ọbịa, onye nēzí ihe; Ọ dịghị onye e nyefere mmanya, ọ dịghị onye na-eti ihe, ọ bụghị onye anyaukwu nke uru uru rụrụ arụ; ma ndidi, ọ bughi onye nālu ọgu, ọ bughi onye anya-uku; Onye nāchi ulo-ya nke-ọma, nēnwe umu-ya n'okpuru ike nile; (N'ihi na ọ buru na onye ọ bula amaghi isi ulo nke aka ya, ọ gēsi aṅa lekọta nzukọ-ya nke Chineke? Ọzọ kwa, ọ ghaghi izi ezi àmà bayere ndi nọ n'èzí; ka o we ghara ịdaba n'ihe-ita-uta na n'ọnyà nke ekwensu. N'otu aka ahụ, ndị dikọn aghaghị ịbụ ndị na-anụ ọkụ n'obi, ghara ịbụ ndị na-ekwu okwu abụọ, ndị na-adịghị enye oké mmanya, ndị na-adịghị anyaukwu n'uru ihe rụrụ arụ; nējide ihe-omimi nke okwukwe n'ama-ihe di ọcha. Ma ka ewe buru uzọ nwawa ihe ndia; mb͕e ahu ka ha were ọlu dikọn, ebe anāhu ha na ha zuru okè. Otú a ka ndinyom-ha gābu kwa ndi nādighi nma, ọ bughi ndi nkwutọ, ndi nēnwe uche, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile. Ka ndị dikọn bụrụ di nke otu nwunye, na-achị ụmụ ha na ụlọ nke ha nke ọma. N'ihi na ndi nēje ozi nke-ọma nāzutara onwe-ha ọnọdu ọma nke-uku na nkwuwaokwu n'okwukwe nke di nime Kraist Jisus. 1 Timoti 3:1-13 N’ihi na onye bishọp aghaghị ịbụ onye na-enweghị ihe a gaeji taa ya ụta, dị ka onye nlekọta nke Chineke; adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, e nyeghị ya mmanya, ọ dịghị onye na-eti ihe, e nyeghị ya uru rụrụ arụ; Ma onye nāhu ile ọbịa n'anya, onye nāhu ezi madu n'anya, onye
Ọ si ha, Gosiri ayi obi-unu bayere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ. Mb͕e ahu nke-mbu malitere, bú onye nēkwu okwu bayere idi-ike nke manya-vine; O we si otú a, Unu ndikom, le ka manya-vine si di ike nke-uku! Ọ nēme ka madu nile kpafue, bú ndi nāṅu ya: Ọ nēme ka uche eze na nwa-nb͕ei ka ha buru otù; nke orù na nke onye nweere onwe-ya, nke ob͕eye na nke ọgaranya: Ọ nēchighari kwa echiche nile ọ bula ka ọ ghọ ọṅù na ọṅù, ka madu we ghara icheta iru-uju ma-ọbu ugwọ: Ọ nēme kwa obi ọ bula ọgaranya, ka madu we ghara icheta kwa. eze ma-ọbu onye-isi; ọ nēme kwa ka ikwu ihe nile site na talent: ma mb͕e ha nọ n'iko-ha, ha nēchezọ ihu-n'anya-ha n'ebe ndi-eyì na umu-nna-ayi nọ, na mb͕e ntà ha miputara mma-agha: ma mb͕e ha sitere na manya-vine, ha adighi-echeta ihe ha nwere. emela. Ndikom, ọ̀ bughi manya-vine kachasi ike, nke nēnye iwu ime otú a? Ma mb͕e o kwusiri okwu a, ọ b͕a nkiti. 1 Esra 3:17-24 Mmanya jọrọ njọ, eze jọrọ njọ, ụmụ nwanyị ajọọ njọ, ụmụ mmadụ niile bụ ajọọ omume, ma otu a ka ọrụ ọjọọ ha niile dị; ọ dighi kwa ezi-okwu di nime ha; n'ajọ omume-ha ka ha gāla n'iyì. 1 Esra 4:37 Eme-kwa-la onye ọ bula nke i nākpọ asì: aṅula manya-vine ime ka i ṅubiga manya ókè: ekwe-kwa-la ka iṅubiga manya ókè soro gi je n'ije-gi. Tobit 4:15 Anọla ala ma-ọli na nwunye nwoke ọzọ, gi na ya nọdu-kwa-la n'aka-gi, eme-kwa-la ka ego-gi tiyere ya na manya-vine; Ka obi-gi we ghara iwezuga onwe-ya n'ebe ọ nọ, I we site n'ọchichọ-gi dabà n'iyì. Ekliziastis 9:9 manya-vine na ndinyom nēme ka ndi-nghọta dahie: Ọzọ, onye nārapara n'aru ikwa-iko gābu onye-efu. Ekliziastis 19:2 Egosila idi-ike-gi na manya-vine; n'ihi na manya-vine emebiwo ọtutu madu. Ọku nēgosi ọnu-ọnu site n'itinye miri: Otú a ka manya-vine si di n'obi ndi-npako site n'iṅubiga-ókèala. Mmanya dị ka ndụ dịịrị mmadụ, ma ọ bụrụ na a ṅụbigara ya ókè: gịnịkwa ka ndụ dịịrị onye na-enweghị mmanya? n'ihi na emere ka ọ me ka madu ṅuria. manya-vine nke anāṅuri na mb͕e-ya fọduru nēweta obi-utọ nke obi, na obi-utọ nke uche: Ma manya-vine nke anāṅubiga manya ókè nēweta obi ilu, ya na njake na ise-okwu. Ịṅụbiga mmanya ókè na-aba ụba nke ọnụma onye-nzuzu ruo mgbe o mere ka ọ maa jijiji: ọ naebelata ike, na-emerụkwa ahụ́. Abarala madu-ibe-gi mba site na manya-vine, eleda-kwa-la ya n'ọṅù-ya: enye-kwa-la ya okwu iru-uju, ewere-kwa-ra ya ka ọ ṅua. Ekliziastis 31:25-31
manya-vine na abù ṅuria obi: Ma ihu-n'anya nke amam-ihe di n'elu ha abua. Ekliziastis 40:20 Lot na umu-ya ndinyom abua we nọdu n'ọb͕à ahu, ha we me nna-ha ka ọ ṅua manya-vine, ha we dinayere ya: n'ihi na ha siri na ọ dighi nwoke ọ bula n'elu uwa nke puru ime ka nkpuru si na ha bilie, n'ihi na ha chere na ebibiri uwa nile. Jesha 19:57 Ha we nye ya manya-vine, ṅu kwa manya-vine; Umu Moab we me Israel n'ebe ahu, n'ala ihe nādighi nke Shitim, iwe Jehova we di ọku megide Israel n'ihi okwu a, O we tiye ajọ ọria nēfe efe n'etiti ha, o we nwua n'etiti umu Israel orú. nnù ndikom. Jesha 85:60-61 Ya mere, mb͕e ekpere madu gēso ya na iru-uku, ọ gaghi-ekwe ka aririọ-ya rigoro n'ebe-ichu-àjà nke Chineke di ọcha. N'ihi na dika manya-vine agwakọtara ya na manya-vine b͕ara uka, ọ dighi utọ ọ nātọ ya na mb͕e gara aga; ya mere mwute naagwakọta ya na Mmụọ Nsọ, ekwetaghị ka ekpere mmadụ bụrụ otu ihe ahụ ọ ga-abụ. Akwụkwọ nke abụọ nke Hermas 10:22 Ma manya-vine na ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya ka m'nworo, ma anu anughi n'ọnum, m'nērighi kwa nri di utọ; ma m wee ruo uju n’ihi mmehie m, n’ihi na ọ dị ukwuu, nke a naenwebeghị n’Izrel. Agba nke Ruben 1:10 Ma mb͕e m'huru ya ka ọ nāwusa manya-vine, n'ihi iṅubigaanya nke manya-vine, ewe ghọb͕urum, we kuru ya, ọ bu ezie na nnam ab͕aghi ya ọdu. Ya mere, ebe m'nāṅubiga manya ókè, amaghm ya; ma ima-nma-ya ghọb͕uworom, site n'udi nke imanma-ya. Agba nke Juda 2:18,24 O were ọla-edo na pearl chọọ ya mma, were kwa ima-nma nke ndinyom wusara ayi manya-vine n'oriri ahu. manya-vine we chigharia anyam abua, ọṅù we me ka obim kpuo ìsì. Agba nke Juda 3:6-7 Ma ub͕u a, umum, asim unu, unu aṅula manya-vine; n’ihi na mmanya na-atụgharị uche n’ezi-okwu, na-akpali agụụ mmekọahụ, na-edukwa anya na njehie. N'ihi na mọ nke ikwaiko nwere manya-vine dika onye nēje ozi ime ka uche-ya di utọ; n'ihi na madu abua ndia nēwepu kwa uche madu. N'ihi na ọ buru na onye ọ bula ṅu manya-vine rue iṅubiga-ókè-anya, ọ nēwere èchìchè nile ruru árú nke nēdubà n'ikwa-iko nātughari uche-ya, nēme kwa ka aru di ọku rue ọb͕à nke anu-aru; ma ọ buru na ihe-ọchichọ di n'iru, ọ nālu ajọ omume, ma ihere adighi-eme ya. Otú a ka nwoke ahu anwuworo, umum; n'ihi na onye nāṅubiga manya ókè adighi-atu egwu madu. N'ihi na, le, o me-kwa-ra ka m'mehie, nke mere na emeghim ka ihere ìgwè madu nọ n'obodo ahu ghara imem, n'ihi na n'anya ihe nile ka m'wezugara onwe-ya n'ebe Tema nọ, M'we me omume jọb͕uru onwe-ya, m'we kpughepu ihe-nkpudo nke ulo-nb͕ochi. ihere ụmụ m. Ma mb͕e m'nāṅu manya-vine, m'nātupurughikwam ihe Chineke nyere n'iwu, m'we kuru otù nwanyi Kenean na nwunye. N'ihi na ezi uche di uku chọrọ nwoke nāṅu manya-vine, umum; ma n'ebe a ka ezi uche di n'ọṅuṅu manya-vine, ka madu gāṅu, mb͕e ọ nēchezi obi-ebere. Ma ọ buru na ọ gabiga ókè a, mọ nke aghughọ nādakwasi uche-ya, ọ nēme kwa ka onye nāṅubiga manya ókè kwue iheárú, na ime omume, ma ghara ime ihere, kama ọbuná inya isi n'ihere-ya, na ibu onwe-ya nsọpuru. Onye nākwa iko adighiama mb͕e ọ nādighi ya, ihere adighi-eme kwa ya mb͕e anēme ya ihere. N'ihi na ọ bụrụgodị na mmadụ bụ eze ma na-akwa iko, a napụrụ ya ọchịchị ya site n'ịbụ ohu ịkwa iko, dị ka mụ onwe m tara ahụhụ. N'ihi na m'nyere nkpa-n'akam, ya bu, ihenjikọ nke ebom; na ihe-ọkiké m, ya bu, ikem; na okpu-ezem,
ya bu, ebube nke ala-ezem. Ma n’ezie echegharịrị m n’ihe ndị a; mmanya na anụ ahụ́ adịghị m eri ruo mgbe m mere agadi, ahụghịkwa m ọṅụ ọ bụla. Mọ-ozi nke Chineke we gosim na rue mb͕e ebighi-ebi ka ndinyom nāchi eze na onye nāriọ n'otù ahu. Ha nēwepu kwa n'aka eze ebube-ya, na n'aru dike-ya, na n'aru onye-nb͕abà, ọbuná ihe-ntà ahu nke bu ihe-ndebe nke ob͕eye-ya. Ya mere, umum, lezienu ókè-ikpe-ọku nime manya-vine anya; n'ihi na mọ anọ di nime ya, bú ajọ ọchichọ, nke ọchichọ di ọku, nke ikwa-iko, nke ire-utọ nke ruru unyi. Ọ buru na unu aṅu manya-vine n'ọṅù, were obi umeala n'egwu Chineke. N'ihi na ọ buru na egwu Chineke apu n'ọṅù-unu, iṅumanya-vine nēbili, ihere nēzu kwa ohi: ma ọ buru na unu onwe-unu nādi ndu, unu emetula manya-vine aka ma-ọli, ka unu we ghara imehie n'okwu-ọnuma, na n'agha na nkwutọ, na nmehie nile nke Jehova. iwu-nsọ nile nke Chineke, ma unu nāla n'iyì tutu oge-unu. Ọzọkwa, mmanya na-ekpughe ihe omimi nile nke Chineke na nke mmadụ, ọbụna dị ka m wee kpughee iwu-nsọ nile nke Chineke na ihe omimi nile nke Jekọb nna m nye nwanyị Kenan bụ́ Batshua, nke Chineke nyere m ka m ghara ikpughe. Na mmanya na-akpata ma agha na mgbagwoju anya. Testament nke Juda 3:10-29 aṅughm manya-vine, ka ewe me ka o si na ya duhie; Testament nke Isaka 2:7